20 Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi, Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.
20 ‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’
Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;
Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n'ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi.
Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ọku nke Chineke esiwo n'elu-igwe da, rechapu ìgwe ewu na aturu, na ndi nējere gi ozi, ripia ha; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.
Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya; Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku, Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.
Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba: Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya; Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya.
Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n'aka Chineke, Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.
Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ? Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?