Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?
Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n'ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M'juputara? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
O we sim, Nwa nke madu, ì huwo ihe ndi-okenye nke ulo Israel nēme n'ọchichiri, onye ọ bula n'ime-ulo nile nke ihe o mere ka ha yie ihe? n'ihi na ha nāsi, Ọ dighi Jehova nāhu ayi; Jehova arapuwo ala-ayi.
O we sim, Ajọ omume nke ulo Israel na Juda di uku ri nne, ala-ha juputa-kwa-ra n'ọbara, obodo a juputa-kwa-ra na nwezuga ikpé: n'ihi na ha siri, Jehova arapuwo ala nka, ọ dighi kwa Jehova nāhu ihe.
Ọ buru kwa na ha ezobe onwe-ha n'elu Kamel, n'ebe ahu ka M'gāchọputa ha were ha; ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n'ala oké osimiri, site n'ebe ahu ka M'gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha.
Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M'gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n'idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ.