Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 22:13 - Bible Nso

13 I we si, Gini ka Chineke mara? Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara? Ọ na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 22:13
15 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di, Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.


Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo: O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.


M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim; Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.


Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi? Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga?


Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu; Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha: N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.


Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike; Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo; Ha siri, Ònye gāhu ha?


Ha we si, Chìneke si aṅa mara? Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu?


Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?


Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n'ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M'juputara? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


O we sim, Nwa nke madu, ì huwo ihe ndi-okenye nke ulo Israel nēme n'ọchichiri, onye ọ bula n'ime-ulo nile nke ihe o mere ka ha yie ihe? n'ihi na ha nāsi, Ọ dighi Jehova nāhu ayi; Jehova arapuwo ala-ayi.


O we sim, Ajọ omume nke ulo Israel na Juda di uku ri nne, ala-ha juputa-kwa-ra n'ọbara, obodo a juputa-kwa-ra na nwezuga ikpé: n'ihi na ha siri, Jehova arapuwo ala nka, ọ dighi kwa Jehova nāhu ihe.


Ọ buru na ha egwubà n'ala-mọ, site n'ebe ahu ka akam gēwere ha; ọ buru kwa na ha arigorue elu-igwe, M'gēme ka ha si n'ebe ahu ridata.


Ọ buru kwa na ha ezobe onwe-ha n'elu Kamel, n'ebe ahu ka M'gāchọputa ha were ha; ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n'ala oké osimiri, site n'ebe ahu ka M'gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha.


Ọ gēru kwa, na mb͕e ahu, na M'gāchiri oriọna chọsie ike nime Jerusalem; M'gēji kwa nmehie ndikom ahu ndi raruru araru n'idi ka manya-vine doro edo leta ha, ndi nāsi n'obi-ha, Jehova agaghi-eme ezi ihe, Ọ gaghi-eme kwa ihe ọjọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan