10 N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu, Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,
10 Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu, bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.
Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya; Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
Olu oké egwu di na nti-ya abua; Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:
Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.
Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ, Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.
Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu: Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.
Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya, Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya, Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.
N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.
Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo; Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha.
Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike, Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe; Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu.
Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.