Ha we welie anya-ha site n'ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n'isi-ha n'ikpoli ya n'ebe elu-igwe di.
otú a ka ọ gēfesa ọtutu mba ọbara; n'ihi ya ka ndi-eze gēkpuchi ọnu-ha: n'ihi na ihe nke anākọghi nye ha ka ha huworo; ọ bu kwa ihe nke ha nāhughi ka ha ghọtaworo.
Ha we si ya, B͕a nkiti, kpuchie aka n'ọnu-gi, soro ayi je, ghọ-kwa-ra ayi nna na onye-nchu-àjà: òle nke ka nma, ka i buru onye-nchu-àjà diri ulo nke otù nwoke, ma-ọbu ka i buru onye-nchu-àjà diri otù ebo na otù ab͕uru n'Israel?