Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 21:30 - Bible Nso

30 Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya, na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 21:30
22 Iomraidhean Croise  

Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n'ala ọzọ, Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n'ubọchi iwe-Ya.


Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n'aka Chineke, Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.


Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?


Ka anya-ya abua hu nbibi-ya, Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.


Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ? Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha?


Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya? Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya?


Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ, Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?


Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi: Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala.


Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè, Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ.


Onye-nwe-ayi n'aka-nri-gi Amapúwo ndi-eze n'ubọchi iwe-Ya.


Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ; Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile.


Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.


Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya: E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.


Ma Ishmael nwa Netanaia chiri ndikom asatọ wepuga onwe-ya n'aka Johanan, jekuru umu Amon.


Chineke ekworo, Nke nābọ̀ kwa ọ́bọ̀, ka Jehova bu; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye-nwe ọnuma; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu n'aru ndi nēmegide Ya, onye nēdebere ndi-iro-Ya iwe ka Ọ bu.


Ubọchi nrubiga-ókè nke iwe ka ubọchi ahu bu, ubọchi ahuhu na nkpab͕u, ubọchi nke ime nkpọnkpọ-ebe na itọb͕ọrọ n'efu, ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri,


ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;


Joshua we si, Kpọrenu nkume uku rue ọnu ọb͕à ahu, do kwa ndikom n'elu ya dika ndi-nlekọta idebe ha:


ma elu-igwe nke di ub͕u a, ha na uwa, ka akpadoworo nye ọku site n'otù okwu ahu, ebe anēdebe ha nye ubọchi nke ikpé na ila-n'iyì nke ndi nādighi-asọpuru Chineke.


buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.


n'ihi na oké ubọchi nke iwe-ha abiawo; ònye pu-kwa-ra iguzo?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan