3 Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu; Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì.
3 Nwee ndidi ka m kwuchaa okwu m, mgbe m kwuchara, gaa nʼihu ịkwa m emo.
Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti; I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.
B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem, Gini gāgabiga kwa n'arum?
Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu? Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?
Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Were ita-uta tiem aka na ǹtì: Ha nāchikọzu onwe-ha n'otù imegidem.
Ndi-eyìm bu ndi nākwam emò: Ma ọ bu n'ebe Chineke nọ ka anyam nātusisi anya-miri;
N'ezie ikwa-emò diyerem, Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n'ikpasu-obi-ilu nile ha.
Nurunu okwum nke-ọma; Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu.
Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya; N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?