Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n'ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.
Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua.
madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.