23 Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè, Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:
23 Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume, mgbe ọ nọ na nchekwa na udo,
Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya, Ma o gēso ya dina n'elu ájá.
Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma, Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ.
N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jū M'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:
N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la; Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.