Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 21:19 - Bible Nso

19 Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya. Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 A na-asị, ‘Chineke na-akpakọtara ụmụ ha ntaramahụhụ nke njehie ha.’ Ka a kwụghachi ha ya, ka ha nwee ike mata ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 21:19
23 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na i nēme nke-ọma, ọ̀ bughi nb͕asa-iru ka i gēnwe? ọ buru kwa na i meghi nke-ọma, n'ọnu-uzọ ka nmehie nāma-kpu dika anu-ọhia: ọ bu kwa n'ebe i nọ ka ọchichọ-ya di, ma ọ kwesiri ka gi onwe-gi chia ya.


Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.


Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá, Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi;


Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha: Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


Dozierenu umu-ya ebe-ob͕ub͕u n'ihi ajọ omume nke ndi bu nna-ha; ka ha we ghara ibili, nweta uwa, me ka elu-uwa dum madu bi juputa n'obodo.


N'ubọchi ahu ha agaghi-asi kwa ọzọ, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì.


Ma, le, asi na ọ muwo nwa, o we hu nmehie nile nke nna-ya, nke o meworo, o we tua egwu, ghara ime ihe dika ihe ndia,


Gini ka unu nēkwu, na unu onwe-unu nātu ilu a bayere ala Israel, si, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì?


Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.


Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba uba n'ebere, Ọ nāb͕aghara kwa ajọ omume na njehie, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere kwa ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.


N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di.


ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ, Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?


Ọ buru na amuam mma-agham nēb͕upu àmùmà, O buru kwa na akam ejide ikpé; M'gābọghachi ọ́bọ̀ n'aru ndi nēmegidem, M'gākwughachi kwa ndi nākpọm asi.


Aleksanda onye nākpu ọlà merem ọtutu ihe ọjọ: Onye-nwe-ayi gēnyeghachi ya ihe dika ọlu-ya nile si di:


Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan