Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 20:8 - Bible Nso

8 Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 20:8
14 Iomraidhean Croise  

Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.


Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.


Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri, Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.


Ihe-egwu nēru ya aru dika miri; Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.


Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.


Anya onye nāhum agaghi-ekirim: Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.


O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie: O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè.


Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura; Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.


Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri; Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ, Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe; N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.


I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu: N'ututu ha di ka ahihia nētó etó.


Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa: Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi.


Ọ gēchighari kwa iru-ya le ebe nile siri ike nke ala nke aka ya: ma ọ gāsu ngọngọ da, agaghi-ahu kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan