Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 20:7 - Bible Nso

7 Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi: Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 20:7
16 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka, le, M'nēme ka ihe ọjọ biakute ulo Jeroboam, M'gēbipu kwa n'aru Jeroboam nwa-nwoke ọ bula, onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, M'gēkpochapu kwa nke fọduru nke ulo Jeroboam, dika madu si ekpochapu ǹsí-anu, rue mb͕e agēkpochapuzu ya.


ozu Jezebel gādi kwa ka ǹsí-anu n'elu ubi n'òkè-ala-ubi Jezreel; ha ewe ghara isi, Nka bu Jezebel.


Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya: Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?


Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ? Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche, Rue mb͕e nb͕anwem gābia.


I nwere ike n'aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la; I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya.


N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di? Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?


O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya; Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.


Site n'ututu rue anyasi anētib͕u ha: Ha nāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi.


Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ, Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.


Ọ buru na esi n'ebe-ya loda ya, Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i.


Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe; Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa: Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.


Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si. Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì?


Ekpochapuru ha n'En-doa; Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.


I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha.


ha gāb͕asa ha n'anyanwu, na n'ọnwa, na n'usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n'anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n'iru ala ka ha gāghọ.


Ọ buru na i felie elu dika ugo, ọ buru kwa na ọ bu n'etiti kpakpando ka edoworo akwu-gi, n'ebe ahu ka M'gēme ka i si rida; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan