Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 20:22 - Bible Nso

22 N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya: Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 20:22
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n'iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.


ndi Sheba we dakwasi ha, chiri ha; ọzọ kwa, ha ewerewo ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.


Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ndi Kaldea doro usu atọ, made imegide camel, chiri ha, ọzọ kwa, ha were ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.


Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike, Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n'uwa.


Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume, N'aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.


Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya, Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.


Ka o rue, n'iriju afọ-ya, Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya, Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.


N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu; Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.


Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya, Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya, Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.


Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah


Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n'ihi na ọ nāsi n'obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m'gāhu ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan