Ibu eboro anumanu nile nke Negeb. N'ala ahuhu na nkpà, ebe nne-ọdum na oke-ọdum na aju-ala na agwọ yiri ọku nēfe efe si abia, ka ha nēbu àkù-ha nile n'ubu umu-inyinya-ibu, na ihe-ha nile di oké ọnu-ahia n'okpu-azu camel, ijekuru otù ndi nāgaghi-abara ha urù.
Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?