Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.
Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.
Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.