Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.
O rue, na mb͕e agadi Solomon, na ndinyom-ya wezugara obi-ya ka o so chi ọzọ: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.
Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.
Jehova we si Setan, Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: ọ nọ nējide kwa izu-okè-ya, ma i nākpalim imegide ya, iloda ya n'efu.
Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n'uwe-iḅa-nkpe n'iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha?
O we nākwasi ya ákwá n'ubọchi asa ahu, nke oké oriri-ha diruru: o rue, n'ubọchi nke-asa, na o gosiri ya, n'ihi na ọ kpagidesiri ya ike: o we gosi umu ndi-ya ilu ahu.