Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 2:5 - Bible Nso

5 Otú ọ di, biko, setipu aka-Gi, metu okpukpu-ya metu kwa anu-aru-ya, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 2:5
16 Iomraidhean Croise  

Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti.


Ma otú ọ di, biko setipu aka-Gi, metu ihe nile o nwere, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.


Jehova we si Setan Le, ihe nile o nwere di n'aka-gi; nání esetila aka-gi metu aru-ya. Setan we si n'iru Jehova pua.


O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.


Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya.


Jehova we si Setan, Le, ọ nọ n'aka-gi; nání debe ndu-ya.


Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua.


Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi: Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi.


bú ndi ahu nke nākpasum iwe n'irum mb͕e nile, nāchu àjà n'ubi nile agbara-ogige, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu brick nile;


Ha gāgabiga kwa n'etiti ya, na nkpà na agu: ọ gēru kwa, mb͕e agu nāgu ha, na ha gākpasu onwe-ha iwe, ji eze-ha, ji kwa Chineke-ha, kọcha nkọcha, ha gēche iru n'elu:


nwa-nwoke nke nwayi Israel ahu we kpọlu Aha ahu, kọcha kwa: ha we me ka ọ biakute Moses. Aha nne-ya bu Shelomit, nwa-nwayi Dibri, nke ebo Dan.


I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Onye ọ bula, mb͕e ọ nākọcha Chineke-ya, o gēbu nmehie-ya.


M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan