Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 2:4 - Bible Nso

4 Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 2:4
15 Iomraidhean Croise  

Ha we chiri anu-ulo-ha biakute Josef: Josef we nye ha nri n'ọnọdu inyinya-ha, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ewu na aturu, na n'ọnọdu anu-ulo-ha, bú ìgwè ehi, na n'ọnọdu inyinya-ibu-ha, we were nri nāzù ha n'arọ ahu n'ọnọdu anu-ulo-ha nile.


n'ìhi gini ka ayi nānwu n'anya-gi, ma ayi, ma ala-ayi? zuru ayi na ala-ayi n'ọnọdu nri, ayi onwe-ayi na ala-ayi gāghọ-kwa-ra Fero ndi-orù: gi nye kwa ayi nkpuru-ọghigha, ka ayi we di ndu, ghara inwu anwu, ka ala we ghara kwa itọb͕ọrọ n'efù.


Ndi-orù-ya we si ya, Biko, le, ayi anuwo na ndi-eze ulo Israel, na eze ebere ka ha bu: biko, ka ayi ke ákwà-nkpe n'úkwù-ayi, na udọ̀ n'isi-ayi, pukuru eze Israel: eleghi anya ọ gēdebe gi ndu.


Jehova we si Setan, Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: ọ nọ nējide kwa izu-okè-ya, ma i nākpalim imegide ya, iloda ya n'efu.


Otú ọ di, biko, setipu aka-Gi, metu okpukpu-ya metu kwa anu-aru-ya, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.


Ihe-nb͕aputa nke ndu onye ọ bula bu àkù-ya: Ma ob͕eye anughi ibasi-nba-ike.


Ma achọtara ndikom iri n'etiti ha ndi siri Ishmael, Emela ka ayi nwua: n'ihi na ayi nwere àkù zoro ezo n'ọhia, bú ọka wheat, na ọka barley, na manu, na manu-aṅu. O we rapu, ghara ime ka ha nwua n'etiti umu-nne-ha.


N'ihi na ùrù gini ka ọ gābara madu, ma ọ buru na o gērita uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya? ma-ọbu ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya?


N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?


N'ihi na ndu kariri ihe eji azù ya, aru kari-kwa-ra uwe-oyiyi-ya.


Ha we za Joshua, si, N'ihi na egosiri ndi-orù-gi n'ezie na Jehova, bú Chineke-gi, nyere Moses, bú orù-Ya, iwu inye unu ala nka nile, na ikpochapu ndi nile bi n'ala nka n'iru unu; ayi we tua egwu nke-uku bayere ndu-ayi n'ihi unu, ayi we me ihe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan