28 Ọ buru na unu asi, Àyi gēsi aṅa chu ya? Ma achọtawo nkpọrọgwu okwu nimem;
28 “Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’
Ma Israel nile gētiri ya aka n'obi, lìe ya; n'ihi na onye a, nání ya, nime ndi Jeroboam nwere gābiaru ílì: n'ihi na ahuru nime ya ezi ihe n'ebe Jehova, bú Chineke Israel, nọ, n'ulo Jeroboam.
N'ìhi gini ka unu nāchum dika Chineke? N'ìhi gini ka anu-arum adighi-eju unu afọ?
Tuanu ujọ n'iru mma-agha: N'ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha, Ka unu we mara na ikpé di.
N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo; Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ.