10 Ọ nākwatum buruburu, m'we la: O we ropu olile-anyam dika osisi.
10 Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara; ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi.
Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ; Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.
Miri nēme ka nkume ta; Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala: Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n'iyì.
Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile, Bú ihe-nnweta nke obim.
Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a? Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?
Setan we si n'iru Jehova pua, were ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n'ọbu-ukwu-ya rue opu-n'isi-ya.
Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri; Agaghi-echeta kwa ya ọzọ: Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.
Gini bu ikem na m'gēche? Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?
Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà, Ha we gwusia nenweghi olile-anya.
Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu; Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.