Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 18:8 - Bible Nso

8 N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu, Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya; ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 18:8
18 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na ọ di eze nma, ka ede ya n'akwukwọ ime ka ha la n'iyì: m'gātù kwa orú nnù talent ọla-ọcha na nnù ise nye n'aka ndi nēje ozi a, iwebata ya n'ulo-àkù eze.


Heman we kọrọ Zeresh, bú nwunye-ya, kọ-kwa-ra ndi nile nāhu ya n'anya, ihe nile nke mere ya. Ndi-ya mara ihe na Zeresh, bú nwunye-ya, we si ya, Ọ buru na Mọdekai sitere na nkpuru ndi-Ju, bú onye i maliteworo ida n'iru ya, i gaghi-enwe ike imegide ya, kama i ghaghi ida n'iru ya.


Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.


Eze, bú Ahasuerọs, we za, si Esta, bú nwunye eze, Ònye ka ọ bu, bú onye a? òle ebe onye a nọ kwa, bú onye ahu nke obi-ya mere ka o zue ime otú a?


Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu, Ọnyà gāma ya.


Maranu ub͕u a na Chineke merem ka m'bagọ ab͕agọ, Na O siwo-kwa-ram ọnyà-Ya buruburu.


N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu, Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,


Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya, Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya, Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.


Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi; Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya: Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.


Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere: N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.


Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di: Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.


Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu, Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.


Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi n'uwa.


Ọ gēru kwa, na onye ahu nke nāb͕anari olu oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'etiti olùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na window nile nke di n'elu ka emegheworo, ntọ-ala nile nke uwa ewe me nkpatu.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchiri nkpọkọta ọtutu ndi di iche iche b͕asa ub͕um n'elu gi; ha gādọgota kwa gi n'ub͕um.


Ma ọ ghaghi kwa inwe àmà di nma site n'ọnu ndi nọ n'èzí; ka ọ ghara idabà n'ita-uta, ya na ima n'ọnyà ekwensu.


Ma ndi nēzube ibu ọgaranya nādabà n'ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādighi nime ha, nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n'iyì.


we teta n'ura manya pua n'ọnyà ekwensu, ebe orù Onye-nwe-ayi nwudeworo ha na ndu ka ha me ihe Chineke nāchọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan