5 Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu, Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.
5 “A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu; ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,
Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya; Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku, Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.
Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya. Àgārapu uwa n'ihi gi? Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?
Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?
Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?
Ìhè ndi ezi omume nāṅuri ọṅu: Ma oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.
Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.
N'ihi na ọdi-n'iru agaghi-adiri onye ọjọ; Oriọna ndi nēmebi iwu gānyu.
Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri: Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.
Le, unu nile ndi nāmuye ọku, ndi ji àkú nēre ọku eke onwe-unu n'úkwù dika ihe-ọkiké: jegharinu n'ire ọku-unu, na n'etiti àkú nile nēre ọku unu funwuworo. Ihe a esitewo n'akam diri unu; n'ihe-nwuta ka unu gēdina ala.
Ma ndi nēmebi iwu di ka oké osimiri nke nāmaghari amaghari: n'ihi na ọ pughi idi jū, miri-ya nāmaputa kwa urọ na apiti.
Mb͕e M'nēmenyu gi, M'gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M'gēkpuchi n'igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya.