Gi na ha agaghi-abu otù n'olìlì, n'ihi na ala-gi ka i bibiworo, ndi-gi ka i b͕uworo; nkpuru nke ndi nēme ihe ọjọ, agaghi-akpọ aha-ha rue mb͕e ebighi-ebi.
N'ihi nka dika ire ọku si erichapu ahihia-ọka, na dika ahihia nke kpọrọ nku si ada n'ọku nēnwu enwu, otú a nkpọrọgwu-ha gādi ka ihe nēre ure, ifuru-ha gāla kwa elu dika uzuzu: n'ihi na ha ajuwo iwu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu kwa okwu-ọnu nke Onye Nsọ nke Israel ka ha lelìworo.
Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru.
N'ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka.