Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n'efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;
Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.
Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.
mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:
Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre:
Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.