Ndi bu ọkpara nke ndi nēnweghi ike gāzù kwa onwe-ha dika aturu, ndi-ob͕eye gāmakpu kwa na ntukwasi-obi: ma M'gēme ka nkpọrọgwu-gi nwua site n'oké unwu, ọ bu kwa ndi-gi fọduru ka o gēb͕u.
Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n'otù n'otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n'ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n'oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n'ọnu-ha.
M'we hu, ma le, inyinya nke aru-ya yiri ozu: onye nānọkwasi kwa ya, aha-ya bu Ọnwu; Hedis we so ya ga. Ewe nye ha ike ichi otù uzọ n'uzọ anọ nke uwa, iji mma-agha, na iji oké unwu, na iji ọnwu, nēb͕u, iwere kwa anu-ọhia nke uwa nēb͕u.