N'ebe ahu ka ha turu oké egwu, n'ebe oké egwu nādigh: N'ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi; I mewo ka ihere me ha, n'ihi na Chineke ajuwo ha.
Gini mere m'huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n'azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Ulo-ikwū nile ha na ìgwè ewu na aturu-ha ka ha gāchiri; ákwà-nkwuba nile ha na ihe nile ha na camel nile ha ka ha gēbupuru onwe-ha: ha gākpọ nkpu bayere ha, si, Ujọ di buruburu.
Ma ndi nāfọdu n'etiti unu, M'gēme ka ida-mbà ba n'obi-ha n'ala ndi-iro-ha: olu nke akwukwọ-osisi ifufe nēfepu gāchu kwa ha; ha gāb͕alaga nb͕alaga mma-agha; ha gāda kwa mb͕e ọ dighi onye nāchu ha.
Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu.