Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 16:9 - Bible Nso

9 Iwe-ya adọkawom O we kpọm asì; Ọ takwasiwom ikekere ezé-Ya: Onye-nkpab͕um nāchichapu anya-Ya n'arum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m, ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m; onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 16:9
17 Iomraidhean Croise  

N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi, Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?


I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya; I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:


Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya. Àgārapu uwa n'ihi gi? Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?


O me ka iwe-Ya di ọku imegidem, Ọ guaram Onwe-ya dika ndi nēmegide Ya.


I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere: I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.


Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa, Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;


N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.


Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha, Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.


Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume, Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.


Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke, Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:


Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi; Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya; N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.


Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche.


N'ihi na Mu onwem gādiri Efraim ka ọdum, di-kwa-ra ulo Juda ka nwa-ọdum: Mu onwem, ọbuná Mu Onwem gādọka, la; M'gēbupu, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.


Bianu, ka ayi laghachikute Jehova: n'ihi na Ya onwe-ya adọkawo, Ọ gāgwọ kwa ayi; O tib͕uwo, Ọ gēkechi kwa ayi.


Aṅulam ọṅu, gi onye-irom: mb͕e m'dara ada, m'bilie; mb͕e m'nānọdu n'ọchichiri, Jehova gāburum ìhè.


Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ewe mapue ha n'obi-ha, ha we takwasi ya ikekere ezé-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan