22 N'ihi na arọ ole-na-ole gābia, M'we je n'uzọ m'gaghi-alaghachi.
22 “Naanị afọ ole na ole ga-agabiga tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.
Tutu alam, ghara kwa ilaghachi, Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;
Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya: Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?
Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ? Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche, Rue mb͕e nb͕anwem gābia.
Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi, I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;
Ka otù onye we so Chineke ruara madu uka, Dika nwa nke madu si aruara madu-ibe-ya uka.
Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia, Ílì dirim.
N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jū M'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:
ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu: