18 Ala, ekpuchila ọbaram, Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.
18 “Ala, biko, ezokwala ọbara m; mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!
Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n'ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n'aka-gi;
ekpuchi-kwa-la ajọ omume-ha, ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie-ha n'iru Gi: n'ihi na ha akpasuwo Gi iwe n'iru ndi nālu mb͕idi.
Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam, Ekperem di kwa ọcha.
Ọbuná ub͕u a, le, n'elu-igwe ka Onye-àmàm nọ, Onye nēkwurum nọ kwa n'ebe di elu.
Chineke, Ọ̀ gānu iti-nkpu-ya, Mb͕e nkpab͕u nābiakwasi ya?
Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova: Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe.
Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara.
N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.
Ala, ala, ala, nuru okwu Jehova.
N'ihi na ọbara-ya adiwo n'etiti ya; n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya ka ọ debere ya; ọ wusighi ya n'ala, ikpuchi ya ájá;