17 Ọ bughi n'ihi na ihe-ike di n'ọbu-akam, Ekperem di kwa ọcha.
17 ma aka m emeghị ihe ike ọbụla, ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.
Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya, Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;
Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali, Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.
N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa, Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.
Ala, ekpuchila ọbaram, Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.
N'ezie eb͕ub͕ere-ọnum adighi-ekwu okwu ajọ omume, Irem adighi-atamu kwa ntamu aghughọ.
Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie; Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:
Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum; Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe.
Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ.
Ulo-ududo-ha agaghi-aghọ uwe, ha agaghi-eji kwa ọlu di iche iche ha kpuchie onwe-ha: ọlu nile ha bu ọlu ajọ ihe, omume nke ihe-ike di kwa n'aka-ha.
ma ka ha kpuchie onwe-ha n'ákwà-nkpe, ma madu ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike: ka ha chighari kwa, onye ọ bula ya pua n'uzọ ọjọ ya, na n'ihe-ike nke di n'ọbu-aka-ha.
Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n'ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka.