Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 16:10 - Bible Nso

10 Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Were ita-uta tiem aka na ǹtì: Ha nāchikọzu onwe-ha n'otù imegidem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị, ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo, jikọtakwa onwe ha megide m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 16:10
22 Iomraidhean Croise  

Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu?


Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu?


Chineke nēmechibidom uzọ nye ndi ajọ omume, N'aka ndi nēmebi iwu ka Ọ nātubàkwam.


N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili; Ukwum abua ka ha nupuworo, We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.


Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja.


Dika miri ka awusiworom, Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha: Obim aghọwo ihe dika wax; Ọ lọwo miri n'etiti afọm.


Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu.


Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha: Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi; Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:


Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem; Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.


Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha, Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya, Dika ha leworo anya nkpuru-obim.


Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume, Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.


Azum ka m'nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m'nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n'ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu.


Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi; Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya; N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.


Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.


Ub͕u a ka i gēdo onwe-gi n'usu ndi nāpunara madu ihe, gi ada nke usu ndi nāpunara madu ihe: nnọchigide-n'agha ka ọ nọchigideworo ayi: ha gēji nkpa-n'aka tie onye-ikpe Israel na ǹtì.


Mb͕e ahu ha busara Ya ọnu-miri n'iru, ti kwa Ya aka: ufọdu we pia Ya ihe,


Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a?


Onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we gwa ndi guzoro ya nso ka ha tie ya aka n'ọnu.


n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi,


N'ihi na unu nānagide ya, ma ọ buru na onye ọ bula eme ka unu buru orù, ọ buru na onye ọ bula eripia unu, ọ buru na onye ọ bula ejide unu, ọ buru na onye ọ bula eweli onwe-ya elu, ọ buru na onye ọ bula apia unu ihe n'iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan