9 Gini ka i mara nke ayi nāmaghi? Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?
9 Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị? Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?
Enwe-kwa-ram obi dika unu; Mu onwem abughi onye dara ada kari unu: Ma ònye ka ọ bu nke ihe dika ndia nādighi n'aka?
Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem: Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.
N'ihi na ònye guzoworo n'ìzù nzuzo nke Jehova, nke ọ gāhu nu kwa okwu-Ya? ònye ṅaworo okwum nti, we nu ya?
Unu nēle ihe di n'iru unu anya. Ọ buru na onye ọ bula atukwasiwo obi n'onwe-ya na ya bu onye Kraist, ya gua nka ọzọ n'onwe-ya, na, dika ya onwe-ya bu onye Kraist, otú a ka ayi onwe-ayi bu kwa.
N'ihi na anamagu na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi.