Ezi madu site n'ezi àkù nke obi-ya nēweputa ezi ihe; ajọ madu site kwa n'ajọ àkù nke obi-ya nēweputa ajọ ihe: n'ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n'ihe nke obi nwebigara ókè.
Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye nēkpere Chineke, mb͕e ọ dighi-akwa ire nke ya nga, kama ọ nāghọ obi-ya aghughọ, okpukpe-Chineke nke onye a bu ihe-efu.