Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 15:30 - Bible Nso

30 Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya; Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku, Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị, ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 15:30
25 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata, Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:


Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di? Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:


N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa, Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.


Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru, Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.


Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri, Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.


Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba: Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya; Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya.


Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi, Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.


N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia, Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.


Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì, Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.


N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.


kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.


N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.


N'ihi nka ka M'jiworo ndi-amuma b͕utue ha; ejiwom okwu nile nke ọnum b͕ue ha: ikpé-gi nile di kwa ka ìhè nke nāputa aputa.


Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n'ọchichiri nke èzí; n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.


Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:


ma agāchupu umu ala-eze ahu bà n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.


Ndia bu isi-iyi nke miri nādighi, buru kwa alulu nke oké ifufe nēfepu; ndi edebeworo ha itiri nke ọchichiri.


buru kwa ebili-miri di egwu nke oké osimiri, nāsuputa ihere nke aka ha dika ufufu; umu-kpakpando nējehie ejehie, ndi edebeworo itiri nke ọchichiri rue mb͕e ebighi-ebi.


Mma-agha di nkọ nēsi kwa n'ọnu-Ya puta, ka O we were ya tib͕ue mba nile: Ya onwe-ya gēwere kwa nkpa-n'aka nke ígwè zùa ha dika aturu: Ya onwe-ya nāzọ kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nke manya nke ọnuma nke iwe Chineke Onye puru ime ihe nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan