22 Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata, Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:
22 O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị; mma agha nọ na-echere ya.
Mb͕e ọ nọ nākpayere ha uka, le, onye-ozi ahu nāridakuru ya: ọ si, Le, ihe ọjọ a sitere n'aka Jehova; gini mere m'nēle anya Jehova ọzọ?
Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di? Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:
Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya; Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku, Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.
Tuanu ujọ n'iru mma-agha: N'ihi na ọnuma nēweta ahuhu-ajọ-omume nile nke mma-agha, Ka unu we mara na ikpé di.
Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha; Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.
Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù, Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.
Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha, Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.
Gini bu ikem na m'gēche? Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?
Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam; M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;
O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n'ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya.