18 (Nke ndi mara ihe nēgosi Site na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;
18 bụ ihe ndị amamihe kwuru, ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,
Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi, Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.
M'gēkwuputara gi, gem nti; Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:
Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala, Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)
Ì mawo nka site na mb͕e ochie, Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,
N'ihi na, biko, jua ọb͕o mbu, Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara:
Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.
Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta: Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.