8 Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala, Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;
8 A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala, maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,
N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya, Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.
Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ, Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.
Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọṅù, unu ndi bi n'ájá: n'ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādighi ndu.
N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru.
Onye nēnweghi uche, adighi-eme ka nkpuru gi onwe-gi nāgha di ndu, ma ọ buru na ọ nwughi anwu: