3 Ọ̀ bu kwa n'aru onye a ka I megheworo anya-Gi, Me ka m'so Gi ba n'ikpé?
3 Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?
Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji? Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?
I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya; I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:
Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba, We so gi ba n'ikpé?
N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya, Na ayi gābiakota n'ikpé.
Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpé; N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi.
Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya? Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya?
Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya?
Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ: