Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 14:2 - Bible Nso

2 Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya: O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 14:2
21 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ndi-ọbìa ka ayi bu n'iru Gi, na ndi-nnọdu, dika nna-ayi-hà nile: ubọchi nile ayi n'elu uwa di ka onyinyo, olile-anya adighi kwa.


Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine, Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.


Site n'ututu rue anyasi anētib͕u ha: Ha nāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi.


(N'ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe, N'ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n'elu uwa:)


Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu; Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala.


Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi; Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile.


Site n'olu ize-umem Ọkpukpum araparawo n'anu-arum.


Madu yiri otù nku-ume Ubọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga.


N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa, Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.


Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah


Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m'leworo anya gini? Ncherem, n'ebe I nọ ka ọ di.


Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.


Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú, Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi; Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi:


ma ọ gaghi-adiri onye nēmebi iwu nma, ọ gaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo, bú nke di ka onyinyo; n'ihi na ọ dighi-atu egwu n'iru Chineke.


ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.


N'ihi na, Anu-aru nile di ka ahihia, Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia. Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan