16 N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu: Ì dighi-elezi nmehiem anya?
16 Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ, ma ị gaghị agụkọ mmehie m.
Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya, I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.
Na I nāchọ ajọ omumem, Nāju kwa ase nmehiem?
I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya; I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:
Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile, Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?
O nētiye ukwum abua nime ọtọsi, Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.
N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu, Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.
Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha, Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya, Dika ha leworo anya nkpuru-obim.
N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di, Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.
I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di: