Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi;
Jekob we si Fero, Ubọchi arọ nke ọnọdu-ọbìam nile di ọgu arọ isi na iri: ha di ole-na-ole, jọ kwa njọ, bú ubọchi arọ ndum, ha erughi kwa ubọchi arọ ndu nke nnam-hà n'ubọchi ọnọdu-ọbia-ha.
Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah