8 Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma? Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?
8 Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe? Unu ga-ekwuchite ọnụ Chineke?
Ọ ghaghi ibara unu nba, Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.
Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma; M'gaghi-etu kwa madu aha.
Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma, Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike? N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.
Ndia bu kwa okwu nke ndi mara ihe. Imata iru madu n'ikpé adighi nma.
Unu emela ajọ omume n'ikpé: ahụla onye nēnweghi ike ikpemara iru ọma, asọpuru-kwa-la iru nke onye uku: n'ezi omume ka i gēkpe madu-ibe-gi ikpe.
Ma Mu onwem emewo kwa ka unu buru ndi anēlelì na ndi di ala n'iru ndim nile, dika unu nādighi-esi edebe uzọm nile, kama unu nāhu madu iru-ọma n'iwu.