5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti! Ọ we ghọro unu amam-ihe.
5 Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị, nke a gaara egosi na unu bụ ndị nwere amamihe.
Ekwukwu-Gi nile nēme ka madu b͕a nkiti; I we chìa ọchì, ma ọ dighi onye nēme ka ihere me gi.
B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem, Gini gāgabiga kwa n'arum?
Biko, nurunu iru-ukam, Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.
Òkwu nke bu nání ifufe gēnwe ọgwugwu? Ma-ọbu gini nēme gi ka i di irè, na i nāza okwu?
Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà? Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.
Rùe ole mb͕e unu gēme ka nkpuru-obim rue újú? Rùe ole mb͕e unu gēwere okwu zọpiam?
Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru, Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu.
Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya.
M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu, N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?
Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n'onye mara ihe: Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.
N'ihi na nrọ abiawo n'ọtutu ije-ozi, olu onye-nzuzu kwa n'ọtutu okwu.
N'ihi nka onye nwere uche gēdere du n'oge ahu; n'ihi na oge ọjọ ka ọ bu.
Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe: