Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 13:4 - Bible Nso

4 Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu, Ndi-dibia efu ka unu nile bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ; unu niile bụ ndị dibịa na-abaghị uru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 13:4
23 Iomraidhean Croise  

M'we zigara ya ozi, si, Ọ dighi ka okwu ndia si di nke gi onwe-gi nēkwu, kama gi onwe-gi nēchèputa ha n'obi-gi.


Anuwom ọtutu ihe dika ihe ndia: Ndi-nkasi-obi nēweta ọnọdu ọjọ ka unu nile bu.


Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya; N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?


Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi, Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;


Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi; Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.


N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe; Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.


Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu: Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile.


Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.


Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n'okwu-ugha nile ha na n'obi-ha nādighi n'otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n'onu Jehova puta.


Ọ dighi onye nēkpe ọnu-gi: ọ dighi ọgwu ntechi i nwere.


Rigorue Gilead, nara balm, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Ijipt: n'efu ka i meworo ka ọgwu ba uba; ọ dighi ọgwu-ntechi i nwere.


Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.


Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n'ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n'aru ada ndim?


Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.


Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n'aru-unu la.


Mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma: abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.


nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n'aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan