Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 13:26 - Bible Nso

26 N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem, I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m, na-emekwa ka m ghọrọ mkpụrụ mmehie m mere nʼoge okorobịa m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 13:26
11 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya, Ma o gēso ya dina n'elu ájá.


N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè? N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?


Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu, Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.


Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.


N'ezie mb͕e m'chigharisiri, m'we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m'mara, m'we tie aka n'apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n'ọnọdu-ihere, n'ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m'di na nwata.


Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus chọputara ya n'ulo uku Chineke, si ya, Le, emewo ka aru di gi nma: emehiela ọzọ, ka ihe jọkariri njọ ghara ime gi.


Ma otù nwoke nọ n'ebe ahu, onye nọri orú arọ na iri na asatọ na nriaria-ya.


_O si ha, Unu akpọlam Naomi, kpọnum Mara: n>ihi na Onye Nke puru ime ihe nile meworom ihe-ilu nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan