23 Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole? Me ka m'mara njehiem na nmehiem.
23 Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere? Gosi m ajọ omume m na mmehie m.
M'gāsi Chineke, Amalam ikpe; Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.
Na I nāchọ ajọ omumem, Nāju kwa ase nmehiem?
Ìhe ọjọ gi abaghi uba? Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.
Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie; Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:
Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti: Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.
Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.
Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: Nānwam, we mara iche-uchem nile: