22 Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa; Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.
22 Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị. Maọbụ, kwerekwa ka m kwuo okwu, ka ị zaa m.
Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu, Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.
I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi: Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti! (Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;) Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!
Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju kwa gi, gi me kwa ka M'mara.
Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam; M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;
N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya, Na ayi gābiakota n'ikpé.
Ka m'kwue okwu, ghara itu egwu Ya; N'ihi na ọ bughi otú a ka m'di n'ebe mu onwem nọ.