20 Nání emelam ihe abua, Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi:
20 “Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke, mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.
Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe? N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume.
Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya; Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi; Ma abali nēnye ìhè dika ehihie: Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi