M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.
M'we hu na unu abughi ndi nāzọputam, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, gabiga imegide umu Amon, Jehova we nye ha n'akam: n'ìhi gini kwa ka unu rigokuteworom ta ibusom agha?
n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu?
Nwayi ahu we biakute Sọl, hu na aru mara ya jijiji nke-uku, ọ si ya, Le, nwanyi nējere gi ozi egewo nti olu-gi, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, nu kwa okwu-gi nile nke i gwaram.