10 Ọ ghaghi ibara unu nba, Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.
10 Ọ ghaghị ịbara unu mba ma ọ bụrụ na unu ejiri okwu ụgha chọọ inyere ya aka.
Ma ub͕u a ka oké egwu Jehova dikwasi unu; lezienu anya, me ya: n'ihi na ọ dighi ajọ omume, ma-ọbu ihu-madu-iru-ọma, ma-ọbu inara-ihe-iri-ngo, di nime Jehova, bú Chineke-ayi.
Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma? Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?
Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma; M'gaghi-etu kwa madu aha.
Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma, Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike? N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.
Rùe ole mb͕e ka unu gēkpe ikpe ajọ omume? Rù kwa ole mb͕e ka unu gāhu ndi nēmebi iwu iru-ọma?
ma ọ buru na unu ele madu anya n'iru, ọ bu nmehie ka unu nēme, n'ihi na iwu ahu nātu unu nmehie-unu n'anya dika ndi-njehie.