Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Job 12:25 - Bible Nso

25 Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè, O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè. Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Job 12:25
10 Iomraidhean Croise  

Ha we were ikpu-ìsì tie ndikom ahu ndi nọ n'ọnu-uzọ ulo, ma onye ntà ma onye uku: ike we gwu ha ichọta ọnu-uzọ ahu.


Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya, Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.


N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.


Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè, Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì.


Jehova agwakọtawo mọ nke nb͕agọ n'etiti ya: ha we dufue Ijipt n'ọlu-ya nile ọ bula, dika onye ṅubigaworo manya ókè si akpafu n'ihe ọ b͕ọrọ.


Uwa gāṅaghari nke-uku dika onye ṅubigaworo manya ókè, ọ gādaghari dika ulo-ọnọdu-abali; njehie-ya gādi kwa arọ́ n'aru ya, o we da, ghara ibili kwa ọzọ.


Ayi nāsọghari ìsì na mb͕idi dika ndi-ìsì, e, ayi nāsọghari ìsì dika ndi nēnweghi anya: ayi asuwo ngọngọ n'etiti-ehihie dika ọ bu chi-ojiji; n'etiti ndi nwere ezi ndu ayi nọ ka ndi nwuru anwu.


Ub͕u a, le, aka Onye-nwe-ayi di kwa n'aru gi, i gēkpu kwa ìsì, nāhughi anyanwu nwa oge. Ngwa ngwa alulu na ọchichiri dakwasiri ya; o we nējeghari nāchọ ndi gējide ya n'aka idu ya.


i gāsọghari kwa ìsì n'etiti ehihie, dika onye-ìsì nāsọghari n'ọchichiri, i gaghi-eme kwa ka ije-gi ọ bula ga nke-ọma: i gābu kwa nání onye anēmeb͕u na onye anānapu ihe-ya n'ike ubọchi nile, onye-nzọputa adighi kwa.


Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n'ọchichiri ahu, nējeghari kwa nime ọchichiri ahu, ọ mataghi kwa ebe ọ nāga, n'ihi na ọchichiri ahu mere ka anya-ya kpue ìsì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan